Question 4
No question available
Observation
Candidates were required to list and describe five punctuation marks.
The few candidates that tried this question did well.
The answers expected were:
i. Kpọm
ii. Kpọmrịkọm
iii. Rịkọm
ịv. Rịkọmelu
v. Akaramkpuchi
vi. Akarauhie
vii. Akaramkpu
viii. Akarangwu
ix. Akaraajụjụ
x. Kpọmkpọm
xi. Akara nkwubiri/ akara kpọmkpọmkpọm
Kpọm: Kpọm bụ akaraedemede a na-etinye na ngwụcha ndebi mkpụrụokwu maọbụ ahịrịokwu. Akara e ji amata ya bụ (.)
Kpọmrịkọm: Nke a bụ akara na-egosi na okwu kwesịrị ịkwụsị mana odee chọrọ ịgbakwụnye
okwu ndị ọzọ.
- A na-etinye nke a n’ahịrịokwu nwere echiche abụọ, mgbe mpaghara nke
abụọ dabeere na nke mbụ. Akara e ji egosi ya bụ (;).
Rịkọm: Nke a bụ akaraedemede odee na-ewebata n’okwu mgbe ọ chọrọ ikurutụume tupu o derekwa gawa. Akara ya bụ (,).
Rịkọmelu: Nke a bụ akara e ji egosipụta na o nwere mkpụrụedemede pụrụ apụ. Ọ na-abata n’okwu maọbụ n’ahịrịokwu mgbe ‘na’ na-arụ ọrụ dịka mbuụzọ.Akara ya bụ (’).
Akaramkpuchi: Nke a bụ akara e ji ekpuchi okwu na-akọwakwu okwu ọzọ. Akara ya bụ
( ).
Akarauhie: Nke a bụ akaraedemede na-ejikọta okwu abụọ ọnụ ka ha nwee ike rụọ ọrụ dịka otu okwu.
- A na-eji ya ejikọ nnyemakangwaa na omekangwaa ọnụ. Akara ya bụ (-).
Akaramkpu: Nke a bụ akara a na-etinye na ngwụcha ahịrịokwu iji gosi okwu e kwuru n’olu ike/ na mgbagwojuanya/ n’ihi okemmasị/ ihe mberede. Akara ya bụ (!).
Akarangwu: Nke a bụ akara a na-etinye n’isi mbido na ngwụcha okwuihu/ okwuekelesu (direct speech). Ọ na-akọwa kpọmkwem etu e siri kwuo maọbụ dee ihe na-enweghị ihe ọbụla e tinyere maọbụ wepụ. Akara ya bụ (“ ”).
Akara ajụjụ: Nke a bụ akara na-adị na ngwụcha mkpụrụokwu maọbụ ahịrịokwu iji gosi na ọ bụ ajụjụ. Akara ya bụ (?).
Kpọmkpọm: Nke a bụ akara a na-etinye n’azụ okwu iji gosipụta ihe e bu n’obi. Akara ya bụ (:).
Akara nkwubiri: Nke a na-abata n’ahịrịokwu mgbe mmadụ ekwuchaghị maọbụ edechaghị ihe o bu n’obi. Akara ya bụ (…).