Igbo Paper 2 WASSCE (PC 2ND), 2020

Question 12


Describe ‘aka ọrụ’ handcraft, to write out twelve (12) handcrafts that Igbos are known for and the advantages of being equipped with handiwork.

Observation


Candidates were required to (a) define ‘otu inyomdi’ and (b) write out the responsibilities of some listed groups towards the community.

Expected answers:

(a) - Otu inyomdi bụ otu ụmụnwaanyị nọ na di n’otu ogbe,ụmụnna maọbụ otu ezinaụlọ.

- Ọ bụkwa otu jikọtara ụmụnwaanyị niile a lubatara n’otu ụmụnna, n’ogbe maọbụ n’otu obodo.


(b) (i) Mmọnwụ

- Otu mmanwụ na-arụ ọrụ dịka ndị uweojii n’obodo site n’ichekwa iwu obodo.

- A na-eji ha agbata nha/ụgwọ n’aka ndị na-emere obodo isiike.

- E ji ha ebelata agwa ọjọọ ndị mmadụ na-akpa n’obodo dịka – izu ohi, ịgwọ nsi, ịtụ ime ọkwa, dg. site n’ikpe ha ikpe.

- Ha na-eme ka ụmụokorobịa bụrụ ndị na-akpa ezigbo agwa ma bụrụkwa ndị kwesịrị ntụkwasị obi.

- Ha na-eme ka obodo kpoo ọkụ.

- E ji ya akwa ozu.

- E ji ya eme ka obodo daa jụụ.

ii. Ụmụnna

- Ụmụnna na-ahụ na e nwere ezi mmekọrịta n’etiti ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.

- Ha na-ekpezi ikpe metụtara ha.

- Ha na-eji otu olu apụta n’ogbe ha ma e nwee ihe dapụtara n’ogbe.

- Ndị ụmụnna ọbụla na-ahụ maka ọdịmma onwe ha.

- Ha na-emebe iwu na-achị ha.

- Ha na-agba mbọ ịhụ na onye ọbụla na-ezere imejọ ndị nọ ndụ na ndịichie.

iii. Ndị eze ọdịnala

- Ha na-eji ewumewu ọdịnala obodo elekọta obodo ha.

- Ha na-agba mbọ ịhụ na obodo na-aga n’ihu ma kwụsiekwa ike.

- Ha na-enye aka imebe iwu e ji achị obodo.

- Ha na-enye ndị obodo ọzụzụ n’ụzọ omenala.

- Ọchịchị ha na-eweta udo n’obodo.

- Ha na-eweta ọganihu na mmepe obodo.

- Ha na-ekwuchitere obodo ọnụ ha n’ihu ndị gọọvmentị.

- Ha na-echekwaba omenala obodo.

- Ha na-eji ọfọ obodo.

- Ha ka ichi ndị mmadụ echichi n’obodo dị n’aka.

 
Untitled Document