Question 12
NO QUESTION AVAILABLE
Observation
Here, candidates were required to list children games in Igboland in (a) and in (b) define fattening culture (Iru Mgbede) and reasons why the culture is fizzling away.
The expected answers were thus:
- - Ịtụ okwe - Ịgba/ịchụ oro
- Ịzụ nchọkọrọ - Ịgba mgba
- Ịkpọ ọga - Ịgba okoso
- Ime akpankoro - Onye elele anya n’azụ
- Ịgba egwu - Isi nri aja
- Kpukpumkpu ogele/ogene - Ịtụ sụwel
- Ịgba bọtịn (mkpọchiakwa) - Ịgba ọsọ
- Ịtụ ụlọ aja - Ịwụ ụdọ
(b) (i) - Iru mgbede bụ mmemme ntopụta ndị Igbo na-emere ụmụnwaanyị mgbe ha tozuru agbọghọbịa ma toruokwa ogo ịlụ di.
- Ọ bụ omenala e ji akwadobe nwaagbọghọ ma doziere ya ọnọdụ site n’ime ya ka o nwee ọmarịcha ahụ nke ga-eme ka ụmụokorọbịa zọwa onye ga-alụ ya.
- Ọ bụ ọnọdụ ezumike nwaagbọghọ chekwara onwe ya nke ọma na-anọ n’ụlọ ndị mụrụ ya iji dị mma n’anya, nwee ọzụzụ pụrụ iche maka nlekọta ezinaụlọ tupu ọ lawa be di ya.
(ii) - Ọbịbịa ndị Bekee wetara mgbanwe metụtara ya.
- Ọtụtụ ndị mmadụ na-alụzi di n’usoro ndịụka metụtara ya.
- Ọtụtụ ụmụagbọghọ enwezighị mmasị n’iru mgbede.
- Ego ọ na-efu/ ihe isi ike.
- Agụmakwụkwọ mere ka ọ laa azụ.
- Mmepe anya mere ka ọ laa azụ.
- Nne na nna na-agbazi mbọ inye ụmụaka ezigbo nri site mgbe a mụrụ ha.
- Ụmụagbọghọ ejighịzi ike arụ ọrụ ubi dịka n’oge gboo.
- Ibi/ịga/ịnọ n’obodo mepere emepe eme mmemme ịlụ di.
- Ụfọdụ ụmụagbọghọ anaghịzi ejideli onwe ha aka tupu ha alụọ di.
Some candidates that attempted this question gave sketchy answers in the (b) part.