Question 5
Observation
Candidates were expected to (a) define a sentence and (b) describe with examples some given types of sentences.
Expected answers:
(a) - Ahịrịokwu bụ otu mkpụrụokwu maọbụ karịa nke dị n’usoro ziri ezi, nwere
ngwaa na echiche zuru ezu.
- Ọ bụkwa nsokọ mkpurụokwu na mkpurụokwu na mkpurụokwu n’ụzọ
kwesịrinụ nke nwere ngwaa, nwekwaa echiche zuru ezu.
- Ọ bụ usorookwu nwere ngwaa na nghọta zuru oke.
(b) (i) Ahịrịajụjụ bụ ụdị ahịrịokwu na-achọ nzaghachi. Nke a bụ ahịrịokwu e ji
ajụ ajụjụ.
Ọ bụ ahịrịokwu mmadụ ji achọ ịmata ihe ọ maghị.
- Ị gara ebee?
- I riri ji m?
- Gịnị bụ aha gị?
- Onye nọ ebe ahụ?
(ii) - Ahịrịntimiwu bụ ahịrịokwu e ji amanye mmadụ ka o mee ihe a chọrọ.
- Nke a na-agwa mmadụ ka o mee ihe ma ọ chọrọ ya maọbụ na
ọchọghị ya.
- Ọ bụ ahịrịokwu na-enye iwu banyere ihe ọbụla a chọrọ ka e mee.
- Pụọ ebe a ọsiịso.
- E nyekwala ya mmanya ahụ.
- Zaara m ụlọ.
(iii) - Ahirinkwusa bụ ụdịrị ahịrịokwu nke okwuu ji ekwusa etu ihe siri mee
maọbụ emeghi, etu ihe siri dị/ adịghị. O nwere ike idị n’ụdi nkwe maọbụnjụ.
- Ọ bụ ahịrịokwu na-ekwu maọbụ na-akọpụta maka ihe.
- Onye nwụrụ anwụ anaghị apụta ụwa ọzọ.
- Ezumike na-adị mma n’ahụ.
- Iti mmọnwụ so n’omenala ndị Igbo.