Igbo Paper 2 WASSCE (PC), 2022

Question 12


Observation

 

Candidates were required to(a)define the term ‘Ịtụ nzụ’ and write out what ‘nzụ’ is used for and
 (b) write out the ordeals of a widow during the  mourning period.
Expected answers:
(a)     (i)   - Ịtụ Nzu bụ otu ụzọ ndị Igbo si anabata ọbịa site n’ịtụpụrụ onye ọbịa nzu ka ọ kaa                   
       n’ala.
       - Ọ bụ usoro e ji atụpụrụ onye ọbịa nzu ka ọ kaa akara ole na ole n’ala ma tụghachiri
         onye nwe ụlọ.      

                     (ii)  - E ji nzu egosi obi ọcha mmadụ nwere n’ebe onye ọbịa nọ.
- E ji nzu edo ihe nsọ.
- Ndị dibịa ji nzu arụ ọrụ.
- E ji nzu egosipụta ịdị ọcha.
- E ji nzu achọ ụlọ mma.
- A na-aracha nzu aracha.
- A na-ete nzu n’ahụ.
- E ji ya ede ihe.
- E ji ya achụ aja/agba afa.
- E ji ya edochi anya ọjị.
- E ji ya achụ ajọ mmụọ.
- E ji ya agwọ ọrịa.
- A na-ere ya enweta ego.
- E ji ya egosi ebe a mụrụ nwa ọhụrụ.

            (b)    -Nwaanyị nọ na mkpe na-eri nri na mpekele eju/ ọ naghị e ji efere eri nri.
- Ọ gaghị asa ahụ ruo mgbe ọ pụtara na mkpe.
- Ọ gaghị abọ isi ya abọ.
- Ọ na-eyi akwa mkpe.
- Ọ naghị achọ onwe ya mma.
- Ụmụọkpụ na-akpụ ya isi.
- Mgbe ụfọdụ, a na-ebunye nwaanyị ahụ mmiri e ji saa ozu di ya ahụ ka ọ ṅụọ.
- Ọ naghị anọ n’oche.
- Ọ naghị eje ebe ọbụla.
- A na-akpanye ya mmaekwu n’aka oge ọbụla.
- N’ebe ụfọdụ, ọ ga na-ebe akwa n’isi ụtụtụ ọbụla.
- Ya na nwoke agaghị enwe mmekọ.
- A na-adọbi ya iheolu ya, manyekwa ya owu ojii n’olu.
- N’ụfọdụ obodo, a na-ahapụ nwaanyị n’ime ụlọ ebe e dowere ozu di ya ka ya na di ya
nọrọ abali ole na ole tupu e lie di ya.
- A na-esi nri nwaanyị isi mkpe na-eri iche.