Question 11
Candidates were requested to define oath taking “Ịnụ Iyi” in (a); in (b) state two reasons for taking oath; in (c) state four methods of oath taking and explain each briefly and in (d) state two sets of people exempted from taking oath.
The expected answers were as follows:
(a) - Ịṅụ iyi bụ ịkpọku ihe ofufe ka ọ bịa gbaa akaebe n’ihe a na-enwe mgbagha na
ya.
- Ịṅụ iyi bụ mmadụ ịkpọku Chineke/Arụsị/Agbara/ ihe ofufe ka ọ gbaara ya akaebe gbasara ebubo e boro ya.
- Ọ bụ ụzọ e si achọpụta eziokwu ka a ghara ilekwasị onye aka ya dị ọcha anya na o mere ihe o meghị.
(b) - Ebubo, - ịzọ ihe, - inyo mmadụ enyo, - ịchọ ihe furu efu, - esemokwu,
-nghọtahie/ mgbagha
(c) - Ịṅefe ozu: Mmadụ nwụọ, o nwee onye a na-enyo enyo, a sị ya bịa ṅefee ozu
onye ahụ.
- Ịkpụrụ ọjị n’obi onye nwụrụ anwụ: Ịgwa onye a na-enyo enyo ka ọ kpụrụ ọjị e
dotere n’obi ozu ahụ.
- Ịṅụ arụsị: Ịsị onye a na-enyo enyo ka ọ ṅụọ arụsị e butere maọbụ arụsị dị
n’okwu arụsị.
- Ịṅụ mmiri ozu: Ịsị onye a na-enyo enyo ka ọ ṅụọ mmiri e ji saa ozu ahụ ahụ.
- Ịkpụ ọjị ala: Ịga n’ihu mmụọ obodo gaa kpụrụ ọjị.
- Ịtụ/ịma/ịkpọ iyi: Ịkpọta eze mmụọ ka o buru arụsị, gọrọ ọfọ gazuo obodo niile mgbe a maghị onye e bu n’obi mere ihe ahụ.
- Iṅefe ọfọ: Ịsị onye e boro ebubo ṅefee ọfọ a tọgbọrọ n’ala.
- Ịracha ọfọ: Ịsị onye e boro ebubo jide ọfọ n’aka gọrọ onwe ya ma detụ ọfọ ahụ ire.
- Ịkpọku Chukwu/Ọbasị: Onye e boro ebubo ịkpọku Chukwu ka ọ gbaara ya akaebe.
- Ịṅụ iyi aja ala: Onye a na-enyo enyo ịgbara ụkwụ nkịtị, chịrị aja n’ala gọrọ onwe ya.
(d) - Ụmụaka
- ụmụnwaanyị dị ime
The few candidates who answered this question tried but fumbled in (d) question.