Question 12
Here, candidates were required to state three Igbo beliefs about children in (a); in (b) conditions Igbo people consider while giving names to their children and in (c) examples of names associated with such conditions/situations in (b).
The expected answers were thus:
- - Ndị Igbo kwenyere na ọ bụghị otu onye nwe nwa/ nwa bụ nke mmadụ niile.
- Ndị Igbo kwenyere na nwa nwoke na-eme ka ama mmadụ ghara ichi.
- Ha kwenyere na nwa na-ejikọ ezinaụlọ na ezinaụlọ, ogbe na
ogbe, obodo na obodo.
- Ha kwenyere na Chukwu na-enye nwa.
- Ha kwenyere na a naghị agụ ụmụ ọnụ.
- Ha kwenyere na ọ bụghị otu onye na-azụ nwa.
- (i) - Nkwenye na Chineke
- Otu onye enweghị nwa
- Nwa kacha ihe niile
- Ọnọdụ dị mgbe a mụrụ nwa
- Ọnọdụ nwa n’ezinaụlọ (onye mbụ, onye abụọ, dg)
- Ịgụ mmadụ ogbo
- Ụbọchị a mụrụ nwa
- Onye lọrọ nwa ụwa
- Iyi/Agbara/Arụsị obodo
(ii) - Nkwenye na Chineke: Chibụikem, Chinweụba, Chukwudị, Chukwudebere,
Chijioke, Chinaza.
- Otu onye enweghị nwa: Adaọra, Adaọha, Nwaọra, Nwaọha, Obiọha, Obiọra, Nwaobodo, Nwaozuzu, Ọhasịrị.
- Nwa kacha ihe niile: Madụka, Nwakaego, Ifeyinwa, Nwakamma, Nwakakụ, Nwabụisi.
- Ọnọdụ nwa n’ezinaụlọ (onye mbụ, onye abụọ, dg): Adanna, Onyeabọ, Ụlụmma, Iheanachọ, Ezuomike, Ihentuge, Ọbịageri, Ọbịanuju.
- Ịgụ mmadụ ogbo: Enyinnaya, Ogbonne, Ogbonna, Nnamdị, Ezinwanne, Nneka.
- Ụbọchị a mụrụ nwa: Nwaeke, Okafọ, Mgbeke, Mgborie, Okorie, Nwaụka.
- Onye lọrọ nwa ụwa: Nnenna, Nnanna, Agụnnaya, Nnenne, Ọnọchie.
- Iyi/Agbara/Arụsị obodo: Ụlasị, Nwaigwe, Nwagbara, Njọkụ, Imo, Ụbụdịegwu, Anyịm.
- Ọnọdụ dị mgbe a mụrụ nwa: Ọsọndụ, Udokamma, Nwaọgụ, Ọnụmajụrụ, Ọnụkwube, Ekwutọsịla, Ọgụeri.
Some candidates that attempted this question made good effort in the (b) part but could not match the situation with correct names.