Question 12
(a) to define ‘ịlọ ụwa’(reincarnation)
(b) write two (2) things Igbo people do to the body of a person who lived a bad life and died,
(c) write two (2) reasons why people reincarnate, ways in which the Igbo people identify people that reincarnated
(d)give the difference between ịlọ ụwa and ọgbanje.
Observation
A.Candidates were required in (a) to define ‘ịlọ ụwa’(reincarnation), in (b) write two (2) things Igbo people do to the body of a person who lived a bad life and died, in (c) write two (2) reasons why people reincarnate, ways in which the Igbo people identify people that reincarnated and in (d)give the difference between ịlọ ụwa and ọgbanje.
Expected answers:
(a)
- Ịlọ ụwa bụ nlọghachite azụ nke onye nwụrụla anwụ n’ụdị nwa a mụrụ ọhụrụ.
- Ọ bụ mmadụ ịnwụ, a mụkwa ya ọzọ n’ụwa.
- Ndị nwe onye ahụ ga-eburu ozu ya, gbaa ya okirikiri wee gwa ya ka ọ hapụ ibi ụdịrị
(b)
- ndụ o biri na mbụ ma ọ bụrụ na ọ bịa ụwa ọzọ.
- A na-enye onye ahụ akaranhụbaama tupu e lie ya.
(c)
- Ịbịa nọnyere onye nke ọ hụrụ n’anya.
- Ịbịa bie ndụ o bighị n’ụwa nke mbụ ya.
- Ịbịa nọchie anya onye nwụrụ anwụ n’ezinaụlọ.
(d) - A na-aga na dibịa gbaa afa agụ n’ebe nwa ahụ nọ.
- A na-esite n’ihe nhụbaama dị onye ahụ n’ahụ mgbe ọ nwụrụ.
- A na-esite n’omume nwatakịrị ahụ na-eme nke yiri omume onye ọ lọrọ ụwa.
(e) - Onye lọrọ ụwa nwere ike ịlọ n’ụlọ, obodo maọbụ ebe ọzọ mana ọgbanje anaghị aga ebe ọzọ./ Mmadụ nwere ike ịlọrọ onye ọzọ ụwa mana ọgbanje na-agaghachi ebe a mụburu ya.
- Mbunuche ọgbanje bụ ịlọghachi ebe o siri bịa na nwa mgbe nta mana ọ dịghị etu a n’ebe onye lọrọ ụwa nọ.
- Ịlọ ụwa nwere ike ịbara onye a lọọrọ uru mana ọgbanje bụ ịta onye mụrụ ya ahụhụ.
- Ọgbanje na-enwe iyi ụwa mana onye lọrọ ụwa anaghị enwe ya.
- Ọgbanje nwụọ, a na-ata ozu ya ahụhụ, mee ya akaje mana ọ dịghị etu ahụ n’ebe ozu onye lọrọ ụwa dị.