Igbo Paper 2 WASSCE (SC), 2019

Question 12


Observation

 

 

Here, candidates were required to define the term ‘ịkwọ aka ụtụtụ’, give the differences and similarities between ‘ịkwọ aka ụtụtụ and ịgọ ọfọ’ and list the materials used in ịgọ ọfọ.
The expected answers were thus:
(a)  -    Ịkwọ aka ụtụtụ bụ ọfọ mbụ nna nwe ụlọ na-agọ n’isi ụtụtụ iji kpọkuo Ọbasị bi n’elu,
ndịichie na ụmụ mmuọ dị icheiche ka ha bịa rachaa nzu maọbụ taa ojị iji chekwa ya na ezinaulọ ya n’ụbọchị ahụ.

          -    Ịkwọ aka ụtụtụ bụ usoro ekpere ọdịnala nke ihe e jiri mara ya bụ ịkwọ aka nke di nwe ụlọ na-ekpe n’isi ụtụtụ tupu ọ waa ọjị.
          -    Ịkwọ aka ụtụtụ bụ mmemme dib u ụlọ na-eme n’isi ụtụtụ nke ọ na-eji mmiri asa aka ya tupu ọ waa ọjị ụtụtụ.
 

(b)        Ịkwọ aka ụtụtụ                                                                      Ịgọ ọfọ
- Naanị n’ụtụtụ ka a na-eme ịkwọ                               - A na-agọ ọfọ oge ọbụla
aka ụtụtụ.
- Ịkwọ aka ụtụtụ dịịrị naanị nna nwe ụlọ.                   - Onye ọbụla nwere ike ịgọ ọfọ.
- A na-eji naanị mmiri akwọ aka ụtụtụ.                      - A na-eji ihe dị icheiche agọ ọfọ.
- A na-anọ naanị n’ihu ụlọ/obi akwọ aka ụtụtụ.          - E nwere ike ịgọ ọfọ ebe ọbụla.


(c)    - E nwere ike ime ha abụọ n’ụtụtụ.
        - A na-eji ha akpọku ndịichie, Ọbasị na ndị mmụọ.
        - Ha bụ ụọ e si ekpe ekpere ọdịnala.
        - Ha bụ ụọ e si enye Ọbasị na ndịichie nsọpụrụ.
        - E nwere ike ịwa ọjị ma e mechaa ha abụọ.

(d)       ọjị, mmiri, nzu, mmanya, ose


The candidates that attempted this question performed badly.