Igbo Paper 2 WASSCE (PC), 2019

Question 11

Write and explain six (6) things that prompt ‘ịgba afa’,
Three (3) ways ‘ịgba afa’ is done and the person that handles ‘ịgba afa’.

Observation

Here, candidates were requested to describe ‘ịgba afa’, to write and explain six (6) things that prompt ‘ịgba afa’, three (3) ways ‘ịgba afa’ is done and the person that handles ‘ịgba afa’.

Expected answers:

(a) - Ịgba afa bụ ije chọpụta ihe dị omimi/miri emi dị n’etiti ndị dị ndụ na ibe ha maọbụ n’etiti ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.
- Ọ bụ ụzọ ndị Igbo si achọpụta ihe gbara ha gharịị nke echiche mmadụ nkịtị agaghị enwe ike ịchọpụta.
- Ịgba afa bụ usoro omenala a na-esi achọpụta ihe dịịrị mmadụ/obodo na ụzọ a ga-esi soo ya.
- Ọ bụ ụzọ e si achọpụta echiche ụmụmmụọ na ndịichie.
- Ọ bụ ụzọ ndị Igbo si achọpụta ihe ga-eme n’ọdịnihu.

 

(b) (i) Ume Ọmụmụ: Mgbe nwaanyị na-amụ nwa, nwa a na-anwụ na-esepụghị aka. Nwaanyị tụrụ ime mụọ nwa, nwa ahụ anwụọ ugboro ugboro.

 

(ii) Amụtaghị Nwa: Mgbe nwaanyị lụrụ di, chee ọtụtụ afọ ma ọ tụrụghị ime, a na- agba afa.

 

(iii) Oke Nrịanrịa: Mgbe mmadụ rịara ọrịa ogologo oge, a na-agwọ ya ma ọ na-arịa kwa, a gbaa afa.

 

(iv) Ọnwụ Ike: Mmadụ ị na-anwụ mgbe ọbụla site n’ihe mberede n’obodo.

 

(v) Ọnwụ Ikwo: Mmadụ ịgbabiri nwụọ n’erughị eru/ịnwụchu anwụchu kwa mgbe kwa mgbe n’obodo.

 

(vi) Mpụta ichi/ nnụnụ ọjọọ dịka Ikwiikwii/aṅụ ịgbachi be mmadụ/ụzọ: Mgbe ọbụla nnụnụ Ikwiikwii febatara n’akụkụ be mmadụ maọbụ mgbe aṅụ kwụchiri n’ụlọ mmadụ, a na-eche na ihe ọjọọ aghaghị ime.

 

(vii) A kpata a tụfuo: Mgbe mmadụ na-akpata akụ ma o jighị ya emepụta ihe bara uru, a na-agba afa.

 

(viii) Ịchọpụta onye lọrọ mmadụ ụwa: A mụọ nwa ọhụrụ, maọbụ mgbe nwata na-akpa agwa edoghị anya, a na-aga gbaa afa ịchọpụta onye lọrọ ya ụwa.

 

(ix) Ịchọpụta onye mere ihe nzuzo/ọjọọ/dị aṅaa n’obodo: Mgbe mmadụ mere ihe nzuzo/ọjọọ dk arụ/ohi/nsi/ịgba ama ụgha maọbụ ihe dị aṅaa mere n’obodo, a na-agba afa iji chọpụta onye mere ya maọbụ ihe butere ya.

 

(x) Obodo gawa agha: Obodo chọọ ịga agha, a ga-agba afa iji chọpụta ka agha ahụ ga-esi gaa.

 

(xi) Ịmata akaraaka mmadụ: Mgbe a chọrọ ịmata akaraaka mmadụ, a na-agba afa.

 

(xii) Nsogbu/Ihe ike: Mgbe mmadụ na-agabiga ihe ike maọbụ na-enwe nsogbu kwa mgbe a na-agba afa.

 

(xiii) Ịchọpụta onye nwe ihe/Ịzọ ala/Esemokwu: Mgbe a na-achọ ịmata ihe butere esemokwu/ onye aka ya dị ọcha/ onye nwe ihe a na-azọ dịka ala maọbụ ihe ndị ọzọ, a na-agba afa.

 

(c) - Afa mmiri
- Afa ugegbe/enyo
- Afa ụkpụkpa
- Afa nwa ọkụkọ
- Afa aja igwugwu
- Afa ego
- Afa ọjị

 

(d) Dibịa afa