Igbo Paper 2 WASSCE (PC), 2019

Question 8

Write out ten complaints laid against Akụbụzọ by Mr Ọfọdị when the heads were judging the fight between them according to the prose Okpa Aku Eri Eri.


Observation

Candidates were requested to write out ten complaints laid against Akụbụzọ by Mr Ọfọdị when the heads were judging the fight between them according to the prose Okpa Aku Eri Eri.

Expected answers:

- O kwuru na hedịmasịta na-achị ọchịchị aka ike.
- Naanị ya na-akọ ihe n’ala ụlọ akwụkwọ.
- Naanị Akụbụzọ na-eri mkpụrụ osisi dị n’ụlọ akwụkwọ.
- Ọ na-eji ụmụakwụkwọ arụ ọrụ ya niile.
- Ọ naghị ekwe ụmụakwụkwọ tụtụtara ndị nkụzi ọzọ azịza.
- Ọ na-amanye ndị nkụzi ịchị ụmụakwụkwọ agara ya ọrụ ubi.
- O kwuru na Akụbụzọ anaghị echeta ndị nkụzi na-eso arụrụ ya ọrụ ubi
- Ọ sịrị na ụmụakwụkwọ na-akpara sọ hedịmasịta nkụ ma na-echuru ya mmiri.
- Ọfọdị kwuru na hedịmasịta anaghị akpọ nzukọ ndị nkụzi maka ịkpa ụzọ ọrụ ga-esi na- agazi.
- Akụbụzọ na-eme naanị ihe masịrị ya.
- Iwu ọbụla masịrị hedịmasịta ka ọ na-eti agbanyeghị ọdịmma ndị nkụzi.
- Ọ sịrị na Akụbụzọ tiri iwu megidere ndị nkụzi nwoke ịga n’ụlọ ndị nkụzi nwaanyị ma buru ụzọ daa iwu ahụ.
- Ọ sịrị na hedịmasịta na-eche ha nche ka ha bụ ndị nga.
- O kwuru na hedịmasịta chọrọ ha okwu mere ha ji lụso ya ọgụ.
- Ọ sịrị na hedịmasịta bu ụzọ bupụ oche ya na akwụkwọ ya n’ezi, burukwa ụzọ tụọrọ ya ọgụ.
- Ọ sịrị na hedịmasịta bu ụzọ lụsowe ndịnkụzi ọgụ.
- O kwuru na hedịmasịta kwesịrị iwepụ ikpe ya na ndịnkụzi n’aka ndị isi.
- Ọ sịrị na hedịmasịta enweghị ikike iti ndị nkụzi ihe.
- Ọ sịrị na hedịmasịta bu ụzọ malite imebi ihe na imerụ mmadụ ahụ.
- O kwuru na hedịmasịta boro ha niile apa dọkasịakwa uwe ha.
- Ọ sịrị na hedịmasịta gwara ya laa gaa rịawa ihe na-arịa ya/ahụ adịghị ya.
- Ọ sịrị na akwụkwọ hedịmasịta ji anakọ ego efughị efu