Igbo Paper 2 WASSCE (PC), 2019

Question 12

Define ‘ike ekpe’ and write out four importance of it;
Define ‘iri ekpe and list ten (10) things one can benefit from it.’

Observation

Candidates were required in (a) to define ‘ike ekpe’ and write out four importance of it; in (b) define ‘iri ekpe and list ten (10) things one can benefit from it.’

Expected answers:

(a) (i) - Ike ekpe bụ mmadụ ịhaziri/ikere ndị be ya ihe ndị o nwere mgbe ọ ka dị ndụ , ịgwa ha ndị o ji ụgwọ na ndị ji ya, ihe ọ ga-achọ ka ndị be ya mee ma ya nwụọ, etu o siri chọọ ka e lie ya maọbụ kwaa ya, ebe ala na ihe niile o nwere dị.

 

(ii) - Ike ekpe na-enye aka ime ka udo dị n’ezinaụlọ nwoke mgbe ọ nwụrụ.
- Ọ na-enye aka ime ka ụmụ nwoke mụrụ na-enye nna ha nsọpụrụ, erubere ya isi,emeta ya mma mgbe ọ nọ ndụ.
- Ọ na-eme ka e nwee ezigbo nghọta n’etiti ụmụnne na ikwunaibe.
- Ọ na-eme ka ndị iro ghara itinye ọgbaghara/esemokwu n’ezinaụlọ nwoke nwụrụ anwụ.
- Ọ na-eme ka onye ọbụla nọ n’ezinaụlọ keta oke n’aka nna ya.
- Ọtụtụ na-eketa ezigbo ihe nke nwere ike ime ha ọgaranya/nke ga-enyere ha aka ibi ndụ nke ọma.
- A na-eji ya amata ihe nwoke nwere mgbe ọ dị ndụ.
- Ọ na-eme ka ihe mmadụ nwere ghara ifu/ịgara ndị ọzọ

 

(b) (i) - Iri ekpe bụ etu ndị nọ ndụ si ekere ihe onye nwụrụ anwụ dị ka ya onwe ya siri kee n’ekpe.
- Iri ekpe bụ mmadụ inweta akụnaụba site n’ekpe e kere mgbe onye kere ya dị ndụ.
- Iri ekpe bụ etu ndị dị ndụ si ekesasị akụ onye nwụrụ anwụ.

(ii) - ala, ụlọ obibi, ụlọahịa/ụlọọrụ/ụlọakwụkwọ, ego, ụmụanụmanụ, osisi nille, ụgbọala, ngwa ejiji/akwa/uwe, ọkwa, akụkụ ubi niile, nwunye, echichi.