Igbo Paper 2 WASSCE (PC 2ND), 2018

Question 11

No question available

Observation

Candidates were required to explain the term ‘onyeakaebe’, a witness in a marriage setting, write out the work done by a witness and seven types of chieftaincy titles in Igbo land.
           
            Most of the candidates that attempted this question got it wrong.

Expected answers were:
(a) i.     -           Onyeakaebe bụ onye na-anọ n’agbata ezinaụlọ nwoke na nke nwaanyị na-
achọ ịlụ
di na nwunye/nwoke na-anọ n’agbata nwoke na-achọ ịlụ nwaanyị na ikwunaibe ya nakwa nwaanyị a na-achọ ịlụ na ikwunaibe nke ya.
-           Onyeakaebe bụ onye nhụta nwaanyị a na-alụ. O nwere ike isi be nke nwoke maọbụ nke nwaanyị mana ọtụtụ ebe ọ na-abụ onye be nke nwaanyị.
-           Ọ bụ onye na-ezirịta ozi n’etiti ọgọnaọgọ.

 ii.        -           Onyeakaebe na-ahụ na udo dị n’etiti di na nwunye ma e nwee esemokwu/
Ọ na-ahụ na udo dị n’etiti ọgọ na ọgọ.
-           Ọ na-esonye n’ihe gbasara alụmdinanwunye site na mmalite ruo na
njedebe.
-           Ọ na-enye aka ịkọwa omenala ndị be nke nwoke na nwaanyị.
-           Ọ na-ezi ozi n’etiti ndị be nke nwoke na nwaanyị.
-           N’obodo ụfọdụ, nwaanyị nwụọ, ọ bụ ya na-ezi ndị mụrụ nwaanyị na nwa ha anwụọla.
-           Ọ bụ ya ka a na-enye akụ nwaanyị na ihe ndị ọzọ n’aka ka o nyefee ndị mụrụ nwaanyị a na-alụ./ Ọ bụ ya na-ebunye ndị ọgọ ihe e ji bịa ịlụ nwaanyị
-           Ọ bụ ya na-anapụta ego isiakụ/ngọ nwaanyị/ idula nwaanyị ma a gbaa alụkwaghịm.
-           Ọ na-eso ahụ ọnụakụ nwaanyị.

         (b)           -           Ọzọ,  Ịsụji, Ichie,  Lọọlọ,  Ịyọm,  Ogburu ọwụsa,  Ajaghịja/
Ajaaja, Eze,  Amanwụrụ, Ọmụ,  Igwe,  Obi,  Onowu,  Nze,  Ozioko,
Asọgwọ,  Ezenwaaanyị, Ekwe, Ogbuehi, Ezeji, dg.