Igbo Paper 2 WASSCE (PC 2ND), 2018

Question 4

No question available

Observation

Candidates were required to list and describe five punctuation marks.
The few candidates that tried this question did well.

The answers expected were:
i.          Kpọm
ii.         Kpọmrịkọm
iii.        Rịkọm
ịv.        Rịkọmelu
v.         Akaramkpuchi
vi.        Akarauhie
vii.       Akaramkpu
viii.      Akarangwu
ix.        Akaraajụjụ
x.         Kpọmkpọm
xi.        Akara nkwubiri/ akara kpọmkpọmkpọm

Kpọm:             Kpọm bụ akaraedemede a na-etinye na ngwụcha ndebi mkpụrụokwu maọbụ ahịrịokwu. Akara e ji amata ya bụ (.)

Kpọmrịkọm:    Nke a bụ akara na-egosi na okwu kwesịrị ịkwụsị mana odee chọrọ ịgbakwụnye
okwu ndị ọzọ.
- A na-etinye nke a n’ahịrịokwu nwere echiche abụọ, mgbe mpaghara nke   
abụọ dabeere na nke mbụ. Akara e ji egosi ya bụ (;).

Rịkọm:            Nke a bụ akaraedemede odee na-ewebata n’okwu mgbe ọ chọrọ ikurutụume tupu o derekwa gawa. Akara ya bụ (,).

Rịkọmelu:        Nke a bụ akara e ji egosipụta na o nwere mkpụrụedemede pụrụ apụ. Ọ na-abata n’okwu maọbụ n’ahịrịokwu mgbe ‘na’ na-arụ ọrụ dịka mbuụzọ.Akara ya bụ (’).

            Akaramkpuchi: Nke a bụ akara e ji ekpuchi okwu na-akọwakwu okwu ọzọ. Akara ya bụ
( ).

Akarauhie:       Nke a bụ akaraedemede na-ejikọta okwu abụọ ọnụ ka ha nwee ike rụọ ọrụ dịka otu okwu.
- A na-eji ya ejikọ nnyemakangwaa na omekangwaa ọnụ. Akara ya bụ (-).

Akaramkpu:    Nke a bụ akara a na-etinye na ngwụcha ahịrịokwu  iji gosi okwu e kwuru n’olu ike/ na mgbagwojuanya/ n’ihi okemmasị/ ihe mberede. Akara ya bụ (!).

Akarangwu: Nke a bụ akara a na-etinye n’isi mbido na ngwụcha okwuihu/ okwuekelesu (direct speech). Ọ na-akọwa kpọmkwem etu e siri kwuo maọbụ dee ihe na-enweghị ihe ọbụla e tinyere maọbụ wepụ. Akara ya bụ (“ ”).

Akara ajụjụ:     Nke a bụ akara na-adị na ngwụcha mkpụrụokwu maọbụ ahịrịokwu iji gosi na ọ bụ ajụjụ. Akara ya bụ (?).

Kpọmkpọm:    Nke a bụ akara a na-etinye n’azụ okwu iji gosipụta ihe e bu n’obi. Akara ya bụ (:).

Akara nkwubiri: Nke a na-abata n’ahịrịokwu mgbe mmadụ ekwuchaghị maọbụ edechaghị ihe o bu n’obi. Akara ya bụ (…).