Igbo Paper 2 WASSCE (SC), 2018

Question 4


Observation

Candidates were asked to define ‘Olundị’ and ‘Igbo Izugbe’, list their characteristics and translate some words from ‘Olundị’ to ‘Igbo Izugbe’

.

The following points were expected:


(a) i. Olundị bụ olu dị icheiche a na-asụ na mpaghara dị icheiche n’asụ otu
asụsụ.
ii. Igbo Izugbe bụ olu asụsụ ahụ a nabatara nke nwa afọ Igbo ọbụla na-aghọta nke e ji ede, agụ ma akụzi ihe.
ọ bụ olu Igbo a nabatara iji sụọ ma dee Igbo.
ọ bụ ụdị Igbo a nabatara ka e jiri na-enwe mmekọrịta, na-asụ, na-ede ma na-akụzi ihe.
ọ bụ olu Igbo jikọtara Igbo niile ọnụ maka ọsụsụ, odide na nkụzi Igbo.

 

(b) i. Njirimara olundị
- o nwere mba a maara nwe ya
- o zughị Igbo niile ọnụ
- ọtụtụ mpaghara mba ndị ọzọ anaghị aghọtacha ya
- e jighị ya ekwu okwu n’ọha
- ọ bụ ndị nwe ya na-asụkarị ya
- e jighị ya akụzi ihe n’ọha/ ọgbakọ
- a naghị ejikarị y aede akwụkwọ

 

(ii) Njirimara Igbo Izugbe
mkpụrụ abịdịị ya zuru ezu
o nweghị mba nwe ya
ọ bụ olu nwaafọ igbo ọbụla na-aghọta
ọ bụ ụdị Igbo e ji edekarị akwụkwọ igbo
a naghị enwe ihe mgbanwe n’ime ya site n’obodo ruo n’obodo
o zuru Igbo niile ọnụ
e ji ya ekwu okwu / akpa nkata n’ọha/ọgbakọ
e ji ya akụzi ihe.
ọ na-aga were were n’ọnụ.

 

(c) i. ashịboko (groundnut) - ahụekere
ii. afịa (market) - ahịa
iii. avụvụ (hardship) - ahụhụ
iv. ishi (head) - isi
v. ile (tongue) - ire

 

Few candidates that attempted this question did very well