Igbo Paper 2 WASSCE (SC), 2018

Question 5


Observation

Candidates were expected to explain the term ‘akaraedemede’, define some listed types and use them in sentences.


The following answers were expected:


(a) Akaraedemede bụ akara ndị ahụ a na-ewebata iji mee ka edemede gaa were were n’ọgụgụ ma nwee nghọta zuru oke.


(b) i. Rịkọm elu (’): ọ bụ akaraedemede e ji egosi na e wepụrụ ụda namkpụrụokwu.
- E ji ya egosi mgbe ‘na’ na-arụ ọrụ dịka mbuụzọ.
ii. Rịkọm ngwu(“ ”): Nke a na-egosi na okwu e kwuru, ihe e dere dị etu onye kwuru/dere ya siri kwuo/dee ya; ọ dịghị ihe ọbụla a gbakwunyere maọbụ wepụ na ya.
A na-ewebata ya mgbe a na-ede okwu ihu/ekelesu.
iii. Kpọmkpọm (:) : A na-eji ya egosi mgbe a na-agụsịsị ihe.
E ji ya ekewa awa na nkeji elekere.
iv. Akaramkpu ( !) : Nke a bụ akaraedemede na-egosi na e ji olu ike kwupụta ihe e dere.
ọ n-egosikwa ihe mwute/ịtụnanya/mberede.


(c) i. Rịkọm elu: Nnenna nọ n’elu.
Ha bịara n’ụtụtụ.
Nri dị n’ite.
ii. Rịkọm ngwu: Onyenkuzi sịrị, “Ta abụghị akwụkwọ.”
Obi sịrị, “ Uwe a dị mma.”
Ada jụrụ, “Olee ebe ị na-aga?”
iii. Kpọmkpọm: Ndị a chọrọ n’ọgbakọ a bụ: Obi, Ada na Chika.
Gaa ahịa zụtarasịa ihe ndị a: ji, ede, ọka na akpụ.
Ihe na-akụ bụ 12:00 nke ehihie.
iv. Akaramkpu: Ewoo! Onye mere ihe a?
Hei! Lee agwọ.
Chei! Arụ e meela.


Majority of the candidates answered this question well and got very high scores.