Igbo Paper 2 WASSCE (SC), 2018

Question 12


Observation

Here, candidates were required to define the term ‘igbu ichi’, list the laws guiding it and its benefits.
The expected answers were thus:
(a) - Igbu ichi bụ ịka nwoke akara pụrụ iche n’ihu.
- ọ bụ igbu nwoke egbugbu pụrụ iche n’ihu.

(b) - Onye a na-egbu ichi anaghị ebe akwa.
- A na-egbu ichi n’oge ụtụtụ.
- Onye a na-egbu ichi anaghị ejide mma onye na-ebgu ya.
- Nanị ụmụnwoke ka a na-egbu ichi.
- N’udummiri ka a na-egbu ichi.

 

(c) - A na-eji igbu ichi amata onye bụ ọgaranya.
- A na-esite n’igbu ichi gosi na mmadụ etoruola ihe e ji nwoke eme.
- E ji ichi achọ mma.
- A na-esite n’ichi onye bu, mata ebe onye ahụ si.
- O na-adị mfe ịchọta onye e gburu ichi ma o fuo.
- E si na igbu ichi enweta ihe onyinye dị icheiche.

 

The candidates that attempted this question performed badly.